Thursday 21 July 2011

Tigbuo na zọgbuo azọchiela ọzọ n’obodo Siria

HOzi si n’aka otu onye so eme ngagharị iwe na Siria kọwara na e gbuola ndị nkịtị 21 na Siria maka ngagharị iwe ha. Nkwafu ọbara ndị a mere ma na Damaskọs ma na Idlib na Dara, dị ka Rami Abelrahman onye isi otu Lọndọn na-ahụ maka mmekpa ahụ na Siria si kwu. Nke a mere ka ọnụ ọgụgụ ndị e gbugooro n’ọgbaaghara a ruo 1,440 kemgbe ọnwa anọ ngagharị iwe bidoro.
Ndị otu nnupu isi a na-akọwa na ngagharị iwe ha juputara sọ n’udo, ma na n’agbanyeghị nke a, ndị e duputara ka ha rụọ ọrụ nchekwaba e jirizie ike egbusi ndị na-achọ mgbanwe. N’aka nke ọzọ kwa, a tụọla ndị ngagharị iwe a aka maka ogbugbu ndị ọrụ nchekwaba na mpaghara Siria dị iche iche.

Rupert Murdock ayọọla mgbaghara maka mpụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi ya mere

HMurdock, onye isi ụlọ ọrụ mgbasa ozi a na-akpọ News of the World ayọọla mgbaghara n’akwụkwọ mgbasa ozi dị iche iche maka ebubo e boro ụlọ ọrụ ya sị na ha jiri igwe kọmputa banye ekwe ntị ndị mmadụ iji zute ozi ha mechara gbasaa. Ihe ndị a gụnyere izụte ozi n’aka ndị ahụ 9/11 metụtara ya na ịgbasa ozi gbasara nwa obere nwa e gburu egbu.
Murdock na nwa ya nwoke ga-abịa n’ihu ọchịchị Briten zaa ajụjụ maka mpụ nke a butegooro oke iwe ọkụ n’ebe ndị Briten na Amerịka nọ. Ka ụfọdụ ndị isi na-ebido iji aka ha arịtu n’ọkwa, ọ naha-adịla ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi News of the World abụ isi kotara ebu, nke na-agaghị eme ebere n’ịgbakasị ya oge iwe ndị mmadụ dakwasara ya.

Ide mmiri kpara mkpamkpa na Lagos

H
Mmiri agbagbuola ihe ruru mmadụ iri abụọ na Lagos. Oke mmiri ozuzo E nwere na Lagos n’ụbọchị ụka gara aga kpalitere nnukwute ide mmiri, nke kpọlara ihe ruru mmadụ iri abụọ ala mmụọ, ma mebie akụ n’ụba ndị mmadụ.

 

Ndị omekome atụọla ogbunigwe abụọ na Suleja

HAkụkọ anyị siri n'aka ndị ụlọ nta akụkọ Channels Television nwete na-akọwa na ndị omekome tụrụ mgbọ ogbunigwe abụọ na Suleja. Nke izizi gbawara ụnyahụ n’ogige ụlọ ụka ndị otu okpukpere chi nke A kpọrọ Evangelical Church of West Africa, na bekee. Ogbunigwe ahụ gburu mmadụ atọ.
O ruchaha mkpụrụ awa 24, ọzọ dawaa n’obodo Madala, nke nọdebere Suleja. Onye okwupute ọnụ ndị uwe ojii na Steeti Niger, bụ Richard Ogunche gwara ndị Channels Television na Mina na ndị uwe ojii nke steeti ahụ na-eme nnyocha maka ịchọpụta ebe aja siri banye na garị.

Ogbunigwe egbuela ihe ruru mmadụ iri na Maiduguri

HOzi anyị siri na onlinenigeria.com nwete na-akọwa na mgbọ ogbunigwe ndị omekome tụrụ n’otu ụlọ ebe a na-agba egwu awantịrọ n’ọdụ ahịa Mammy Market na Maiduguri na Bornu Steeti gburu mmadụ iri, ma merụkwaa ọtụtụ mmadụ ndị ọzọ ahụ. Ụlọ egwu awantirọ ahụ nọdebere isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. N’ọzọ dịka ibeya, anyị nụrụ na mkpamkpa a kpara na sọndee, ụbọchị ndị abalịdịegwu gbagburu onye isi gọọmenti okpuru ọchịchị Jere, bụ Jere Local Government Area, n’olu bekee [Gụọọ akụkọ a na bekee].

 

 

Ụlọ omebe iwu Sinet anabatala ndị minista asaa

HỤlo omebe iwu sinet nke ala Nigeria anabatala mmadụ asaa ndị onye isi ala bụ Goodluck Jonathan họpụtara maka ọkwa minista. Otu n’ime mmadụ asaa ndị a bụ nwada Alison Deizani, onye jibu ọkwa minista ngalaba mmanụ akụ chi nyere.
A nabatara mmadụ asaa ndị ahụ ka ndị omebe iwu sinet mechara nnyocha nke were ha awa asaa. Ndị omebe iwe na Sinet gbara ha ajụjụ. Mmadụ asaa ndị ahụ zara ajụjụ gbasara otu ha siri chị ọchịchị mgbe ha bụbu minista, yana ịhe bụ atụmatụ ha n’ọdị n’ihu m’ọ bụrụ na ha banyekwe n’ọchịchị ọzọ [Gụọọ akụkọ a].

 

Goodluck Jonathan akpọọla oku ka A na-azụ ngwa ahịa ndị E mere n’ala Nigeria

HOnye isi ala Nigeria bụ Goodluck Jonathan akpọọla ndị Nigeria oku ka ha na-azụ ngwa ahịa na akara ngwa ndị E mere n’ala Nigeria. Jonathan kpọrọ oku a site n’akara ama Facebook ya.
Ọ sị na ọ bụrụ na ndị Nigeria na-ego ngwa ahịa ndị E mere n’ala Nigeria, nke a ga-eme ka ego ọbụla a kpatara na Nigeria, nọrọkwa na Nigeria, ma butekwe ọganiihu nye ala Nigeria.
Jonathan kwuru na otu n’ime atụmatụ gọọmenti ya bụ ime ka ọnọdụ akụ n’ụba ala Nigeria kwụrụ chịm.

 

Barack Obama ewepụtala atụmatụ ịkpọlata ụfọdụ ndị agha Amerịka nọ n’Afganistan


HN’izu a ka a na-atụ onye isi ala Amerịka bụ Barack Obama anya ka ọ maa ọkwa na ya bụ ugo eberela na mgbagbu. Ndị agha ga-erucha ọnụ ọgụgụ 30,000 ka Amerịka na-atụ anya ịkpọlata tupu afọ 2012 erute isi njedebe.
Onye Ode Akwụkwọ Maka Nchekwaba Obodo bụ Robert Gates na-akọwa na oge a agaghị ezu iji mee mmesị mmesị dị n’ịkpọla ndị agha ọnụ ọgụgụ ha haruru otu ahụ. Na-gbanyeghị nke a, Obama ji n’aka na ọ ga-enwe ike imenwu nke a na-enyeghị nchekwaba obodo Afganistan mmekpa ahụ ọ bụla. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ndị agha ndị a ga-ebido lọtaba n’ọnwa Julaị. Nke a so na atụmatụ inyefe nchekwaba obodo n’aka mba Afganistan n’afọ 2014.
O kwesịkwara ka e bubu n’uche na ọnụ ọgụgụ ụmụ afọ Amerịka ndị kwadoro atụmatụ a gbalitere ofuma kemgbe ọnwa Mee, tụmadị n’ihi na ogbugbu onye isi ndị otu eyimegwu ahụ meziri ka ọ dị ka ọrụ mba Amerịka nwere n’Afganistan agwụchaala.

A tụọla ogbunigwe ọzọ n’Abuja

HOnye isi ala Nigeria ekwuola n’ogbunigwe ahụ A tụrụ n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii n’Abuja jọgburu udele ma sigbuo nkapị. Site n’ihe O dere n’ama Facebook ya, Jonathan kwuru na gọọmenti ga-agba mbọ chọpụta ebe mmiri siri ba n’opi ugbọgụrụ. Ọ sị na gọọmenti dị njikere ịchọpụta yana ịkpachi ndị niile kpara ajọ agwa a.
Jonathan gbakwunyere n’olu bekee na ya ga-emezu nkwa O kwere ndị ala Nigeria. Ọ sịrị: [Gụọọ akụkọ a]

Alkaịda ahọpụtala Ayman Al Zawahiri dịka onye ndu ya

HAlkaịda, otu otu agha inyi egwu A ma ama maka ibu agha megide mba Amerịka na mba ndị ọzọ ha n’Amerịka na-azụkọrịta okwe, ahọpụtala Ayman Al Zawahiri dịka onye ndu ya. Nke a mere ka ọnwa abụọ gachara kemgbe ndị agha mba Amerịka gbuchara Osama Bin Ladin. [Gụọọ akụkọ a]

Obama na Jonathan kpara ụbụbọ na New York

HOnye isi ala mba Amerịka bụ Barack Obama akpọkuola ala Nigeria ka ha na-ehiwe aja n’ukwu ọchịchị onye kwuo uche ya n’ụdị ga-eme ka Nigeria bụrụ eji ama atụ nye mba Afrịka ndị ọzọ.
Obama kpọrọ oku a na New York n’oge ya na onye isi ala Nigeria bụ Goodluck Jonathan nwere nzukọ n’abalị 8 nke ọnwa juunu. Obama nyere ala Nigeria ezigbo otito maka mbọ ha na-agba maka iwete udo na mpaghara Afrịka dị iche iche.
Jonathan kelere gọọmenti mba Amerịka maka nkwado ha nyere ala Nigeria n’oge ntụli aka elu maka ịhọpụta onye isi ala, bụ nke e mere na Nigeria n’oge gara aga.

Super Eagles na Albiceleste ga-ezute ọzọ na Septemba

HOtu egwuregwu bọọlụ ụkwụ Super Eagles nke ala Nigeria eturula ugo mmeri n'asọmụmpi bọọlụ enyi na enyi dara n’etiti Super Eagles na Albiceleste nke mba Argentina. Nigeria jiri ọkpụ anọ nke A sara nanị otu were merie Argentina n'asọmụmpi ahụ E mere n'abalị abụọ nke ọnwa juunu, n’ama egwuregwu bọọlụ ụkwụ dị n'Abuja.
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ ụkwụ na Nigeria, bụ NFF n'aha ịchafụ, ekwetego na Nigeria na Argentina ga-ezute ọzọ maka ikụgharị bọọlụ a n'agba nke abụọ ya. Onye odeakwụkwọ ngalaba NFF bụ Musa Amadu gwara ndị nta akụkọ na E binyego aka n’akwụkwọ niile kwesiri ime ka agba nke abụọ asọmụmpi a nwee isi. Ndi Super Eagles na ndi Albiceleste ga-ezute ọzọ n’abalị 6 nke ọnwa septemba.

Ndị ọgụ isi ekwe ọnwụ egbuola mmadụ 80 na Pakịstan

HKemgbe mba Amerịka gbagbuchara onye isi ndị otu eyimegwu bụ Osama Bin Laden, e mere ka ngalaba niile metụtara Amerịka, ma ndị nọ n’ụlọ ma ndị nọ na mba ofesị, dị njikere maka inweta mmekpa ahụ ndị ọgụ isi ekwe ọnwụ maka onye isi ha e gburu.
Taa ka ya bụ mkpamkpa kpara n’ala Pakịstan ebe ndị ọhụrụ ndụ kwe ọnwụ jiri mgbụọ ogbunigwe wakpo ụlọ ọzụzụ ndị agha na mpaghara ugwu ọdịda anyanwụ, ebe ha gburu mmadụ 80 ma merụọ mmadụ karịrị 140 ahụ. Imirikiti ndị a e gburu bụ ndị agha a ka na-azụ azụ, dị ka Bashir Ahmad Bilour, onye minista si kwuo. Ndị otu Taliban kweere ike na ọ bụ ha gburu ebelebe a iji lụọ ọgụ mmekwụrụ maka onye isi ha e gburu.

Amerịka egbuela Osama Bin Ladin

HPrezidentị mba Amerịka, Barack Obama, kwuru na ndị agha mba Amerịka na Pakịstan egbuela onye agha iyi egwu nke ụwa ma ama, bụ Osama Bin Ladin.

Goodluck Jonathan enwela mmeri

HAla Nigeria ahọpụtagharịala Prezidenti Goodluck Jonathan na ntụli aka ozuru mba nke e ji ahọpụta onye isi ala, bụ nke e mere n’abalị 16 nke ọnwa eprel. Mgbe Ọ gwara ndị ala Nigeria okwu, Jonathan kelere ndị ala Nigeria, ma kwuo na mmeri a abụghị nke nanị ya, ma ọ bụ nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ PDP. Kama, O kwuru na mmeri a bụ nke ndị Nigeria niile.
Ka otu n’ime ndị ha na Jonathan zọrọ yabụ ọkwa onye isi ala, bụ Muhammadu Buhari, na-ekwu na nrụrụ aka dị na yabụ ntụli aka e mere, tigbuo na zọbuo na-ada na mpaghara ugwu ala Nigeria. Ndị isi ekwe ọnwụ ji iwe na ọnụma na-emebi akụ n’ụba na ndụ ndị mmadụ na Steeti Kaduna yana Kano. Anyị nụrụ n’ihe karịrị narị mmadụ atọ anwụọla.

Barcelona na Real Madrid gbara ọhaanya

HNa bọọlụ nke a gbara taa, ndị otu Real Madrid na Barcelona enweghị onye merịrị ibe ya, ebe ha nyere onwe ha otu goolu otu goolu. A gachara okara egwuregwu a na nkeji nke 45 na-enweghị onye ọ bụla nyere goolu, ma ka a lọchighatara ezumiike, ndị Barcelona e mee ngwangwa nye otu goolu. A dọgideziri gagaga a ọ dịzie ka Barcelona aga-emerị, kama ka ọ fọrọ sọ nkeji itolu n’elekere, Real Madrid asịara ọnụ ha site n’inyekwụrụ otu goolu. Bọọlụ nke taa kajara akaja, bịakwa nwee ọtụtụ oge obi na-ama kpumkpum.

E jirila ike chụtuo Laurent Gbagbo n’ọchịchị

HN’ikpeazụ, ìtè sị ọkụ pú, ọkụ asị ite pu dị n’etiti Laurent Gbagbo na Alassane Ouattara erutela isi njedebe.
Ntụli aka elu e mere kemgbe ọnwa anọ gara aga biri n’ọgbaaghara, ebe aka na-achịbu mba Kodivụa bụ Gbagbo jụrụ ịrịtu n’ọchịchị na-agbanyeghị na otu jikọtara mba ụwa kwekọrịtara na ọ bụ Ouattara tuuru ugo na ya bụ ntụli aka elu. Kemgbe ọnwa anọ ahụ ka ndọrọndọrọ a nke butegooro oke tigbuo na zọgbuo n’ala Kodivụa na-aga n’ihu. Naarị kwuru naarị mmadụ tụfuru ndụ ha na nzọgbunzọgbu a ka Gbagbo, onye nọgooro n’ọchịchị afọ iri, na-aga n’ihu n’ikwu na ọ bụ ya merịrị na ntụli aka elu ahụ. [Gụọ akụkọ a]

Barack Obama ga-eso azọ ọkwa onye isi ala mba Amerịka n'afọ 2012

HOnye isi ala mba Amerịka bụ Barack Obama ekwuputela na ya ga-eso azọ ọkwa onye isi ala mba ahụ n'afọ 2012 na-abịa abịa. Ọ kọwapụtara mmasị ya n’ụbọchị Mọndee, site n’ihe onyonyo O tinyere n’akara ama saịba ndọrọndọrọ ọchịchị ya, bụ www.barackobama.com.
Ruo ugbu a, e nwebeghị onye otu ya bụ demokratik pati pụtara ịchere Obama aka mgba. Ọ bụrụ na nke a emeghị, Obama ga-azọ ọkwa prezidenti na afọ 2012 n'aha otu pati ya bụ demokratik pati.
N’aka nke ọzọ, ndị rịpọblikan pati enwebeghị onye ha họpụtara maka izọrọ ha ọkwa onye isi ala. Ha ga-amalite ntụli aka elu nke okpuru ụlọ ha maka ịhọpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa onye isi ala na nso a.

Ụgbọ elu agha Amerịka abọrọla ọkụ, daa na Libịa

HỤgbọ elụ ndị Amerịka ji alụ agha bọọrọ ọkụ taa bụ Tuuzde ka o na-efe na Libịa, were daa. Mmadụ abụọ ndị nọ n’ime ya gbalahara ọnwụ site n’iji akwa e ji esi n’ụgbụọ elu efetu were fetuo.
Ka otu jikọtara mba ụwa nyechara onye isi ala Libịa bụ Gadhafi iwu ka ọ kwụsị mmekpa ahụ o na-enye ndị ahụ na-achọ ka ọ rịtuo n’ọchịchị, Gadhafi gara n’ihu n’ịtụ mgbụọ ogbunigwe ka o sibu atụ. Nke a kpatara ka mba ụwa bịakọta ọnụ n’ịkwụsị ya bụ nkwafu ọbara, malite na mba France ndị nke jiri ụgbụọ elu ha tụọ ndị agha Gadgafi mgbụọ ogbunigwe. Mba Briten na Amerịka mechara tinye aka n’ịkwụsị ndị ahụ na-alụrụ Gadhafi ọgụ.
Ụgbụọ elu agha Amerịka ahụ, nke a na-akpọ F-15E Strike Eagle, fejere Libịa iji tụkwaa mgbụọ ogbunigwe nke ya oge igwe na-eneye ụgbụọ elu ahu ikikere mechaziri nwee nsogbu, nke mere ka ụgbụọ ya daa ma gbarisie. Onye ofe ụgbụọ elu na onye na-ahaziri ya mgbụọ jiri akwa ahụ fetuo n’udo. Mba Amerịka zutere ma zọpụta otu onye n’ime ha, ebe ndị otu ahụ na-alụso Gadhafi ogu zọpụtara ma chekwaba nke ọzọ nke ọma ruo oge ndị Amerịka bịara kpọrọ ya.
Ka Gadhafi kwere nkwa na ya agaghị akwụsị ọgụ ya, mba ụwa ekwekwaala nkwa na ha agaghị ahapụ ịtụ ndị agha ya mgbụọ ruo oge o jiri rubere iwu ahụ otu jikọtara mba ụwa nyere ya isi.

Ọghọm radieshọn emeela ka A kwụsị ọrụ n’igwe nuklịa na Japan

HỌghọm radieshọn sitere na mgbarisi igwe nuklịa na obodo Japan e meela ka a kwụsị ịrụ ọrụ n’ebe igwe ndi ahụ nọ n’ihi na ọghọm a kazi njọ. Ya mere na ịgba igwe ndị ahụ mmiri ka ha jụlata oyi akwụsịla maka na ọghọm radieshọn eruola oke ndị ọrụ na-enweghị ike ịnọgidenwu. Ndị isi ochichi sị na ha ga-ejizi ụgbụọ elu nta were gaa n’ihu n’ịgbasa ha bụ igwe mmiri.
Ka ala ọma jijiji butere ide mmiri gbúrú­­­ mmadụ 10,000 mechara, ihe ọghọm nke a abụrụla ọsụkịrịgada nke àgbà abụọ nyere mba Japan. Ọchịchị Japan enyela ọtụtụ ndị biketara igwe ndị a nso iwu ka ha zere ịpụta ezi ma ncha, ebe a kpọpụtara ndị mmadụ ọnụ ọgụgụ ha ruru 200,000 ndị kara biketa igwe ndị ahụ nso. Ọghọm a nke na-agbasa n’ikuku ọsọ ọsọ eruchaala isi obodo Japan bụ Tokyo, nke jiri maịlị 150 (kilomita 240) nọrọ na ndịdị obodo Fukushima ebe ọkụ a gbara. Ọnụ ọgụgụ ndị butegooro ọrịa radieshọn a eruola 150.

Otu igwe nuklịa na Japan emebiela

Otu igwe nuklịa e ji agbahuo ọkụ latiriki na Japan emebiela, ebe ụfọdụ na-atụ anya na ọzọ nwekwara ike imebi. Ala ọma jijiji ahụ merenụ mere ka otu n’ime igwe ndị a dị n’obodo Fukushima gbaa dúm ka mgbụọ ogbunigwe, were gbarisie ụlọ e jiri rụchide ya. Mmebi igwe nke a butere ahụ ọma jijiji n’ebe ndị Japan nọ maka na ha na-atụ egwu sị na nke a ga-ebute mbusa ọghọm radieshọn n’olu bekee.
HNdị dibịa na-agwọ mmadụ itolu ndị butegooro ya bụ ọghọm. Ndị ọrụ na-agbakwa mbọ n’ịgbasa ya bụ igwe mmiri ka o were jụlata oyi. N’agbanyeghị sị na ndị ọrụ na-amawanye n’ọrụ n’atụfụghị oge ọ bụla, ndị isi ọchịchị na ndị ọkachamara ndị Japan ndị ọzọ na-akọwa na ụmụ ihe adịbeghị njọ nke otu ahụ. Ka aka niile banyere n’ọrụ n’idozi ihe a mebirinụ, ma zerekwa ọzọ ime, mba Japan, ndị nke chekwubefere n’igwe nuklịa ófè, ga na-enweta onwe ha n’ọnọdụ enweghị ọkụ latiriki ugboro ugboro.

Ala ọma jijiji egbuela ọtụtụ ndị mmadụ na Japan

HA na-achọ puku kwuru puku ndị mmadụ achọ na Japan kemgbe mba ahụ nwere oke ala ọma jijiji nke ndị ọka mmụta tinyere na 8.9 n’ogo mgbakọ ala ọma jijiji n’ụbọchị Fraịdee.
Ala ọma jijiji ahụ kpalitere ide mmiri sụnami, bu nke nyekwuru aka n’imebi ụlọ, akụ n’ụba, yana igbu ndị mmadụ.
Ozi anyị nwetere na-akọwa na narị mmadụ asaa anwụọla. Ọnụ ọgụ ndị tufuru ndụ ha n’ihe mberede a ka ga-agbago.
Ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ na-mpaghara Japan ebe ala ọma jijiji a metụtara.
N’ọ dị n’ihu, anyị ga-nwete ọnụ ọgụ ndị nwụrụ anwụ, ndị merụrụ ahụ, yana ọnụ ego akụ n’ụba ala ọma jijiji a mebiri.

Nkwafu ọbara ka na-agakwa n’ihu na Libịa

HIzu a emezuola ya izu anọ kemgbe nkwafu ọbara na Libịa bidoro. Ihe bidoro ka ngagharị iwe abụrụziela agha nke otu obodo igbusisi onwe ha. Ka tigbuo na zọgbuo nke a na-achọghị ibi ebi, ndị agha Gadhafi e jirila ụgbụọ elu e ji alụ agha atụgbusi ndị ahụ na-alụso ha ọgụ ná mgbụọ ogbunigwe. Ha chọrọ ka ha napụta mpaghara ọwụwa anyanwụ obodo ahụ n’aka ndị ahụ na-alụso ọchịchị Gadhafi ọgụ n’ihi na mpaghara ahụ bu ebe mmanụ akụ Chi nyere juputara. [Gụọ akụkọ a]

A gbagbuola ọtụtụ ndị na-eme ngagharị iwe na Libịa

HN'abalị nke 25 n'ọnwa nke abụọ nke afọ 2011, ndị otu ndị na-akwado ọchịchị Libịa ghajusiri mgbọ egbe n’ikuku, ebe ha na-emegide ndị ahụ na-eme ngagharị iwe megide onye isi ala Libịa bụ Moammar Gadhafi. Ndị na-eyi egwu a buuru egbe ga nọdusie n'elu ụlọ ya na n'akụkụ iro, wee site n'ebe ndị ahụ agbekịịnyere igwè ndị mmadụ ahụ egbe nke mechara laa otutụ ndụ n'iyi. Taa kwa, ndị na-akwado ọchịchị Gadhafi jiri ike na ọgụ ga napụta otu ọdụ ụgbụọ elu a kpọrọ Misrata Air Base, nke bụ nke dara n'aka ndị ahụ chọrọ ka Gadhafi rịtuo n'ọkwa. [Gụọ akụkọ a] [Gere akụkọ a]

Ọsọ na ije ka obodo dị iche iche ji akpọpụtasị ndị be ha nọ Libịa

HPuku kwuru puku mmadụ ejirila ọsọ na ije esi Libịa agbafesị Ijipt ha ji azọ ndụ ha. Gọọmenti obodo dị iche iche amalitesịwakwala ịkpọlata ndị be ha nọ Libịa dị ka oke nkwafu ọbara dị n’obodo ahụ kazi njọ.
Dịka otu onye Ijipt nọbu na Libịa si kwuo, ọgbaaghara dị ebe ahụ karịziri akarị. Nke a mere ka ndị mmadụ nyara ụgbọ ala ha ruo oke ala Libịa na Ijipt, bịa werezie ụkwụ baa Ijipt. [Gụọ akụkọ a] [Gere akụkọ a]

 

Ndị Libịa chọrọ ka Gadhafi rịtuo n'ọchịchị

HGọọmenti mba Kanada akatọọla gọọmenti mba Libịa maka ọgụ ahụ ndi otu prezidenti Moammar Gadhafi bara ndị mba ahụ na-eme ngahgarị iwe. Ọgbaaghara na-ada na mba Libịa kemgbe izu ụka gara aga. Imirikiti ndị mba Libịa na-eme ngagharị iwe, na-akpọ oku ka prezidenti mba ahụ bụ Moammar Gadhafi rituo n’ọkwa. Gadhafi na-achị mba Libịa kemgbe afọ iri anọ gara aga. [Guọ akụkọ a] [Gere akụkọ a]

Mubarak arịtuola n’ọkwa

HOnye ji ọkwa presidenti mba Ijipt rituru n’ọkwa n’abalị 11 nke ọnwa ọktoba. Nke a mere ka ngagharị iwe ndị mba ahụ na-eme banyere mkpụrụ ụbọchị nke iri na asatọ ya.
Onye vaịs presidenti mba ahụ, bụ Suleiman, wetere ozi arụkwaghị m Mubarak na fraịdee. Mubarak nyefere ọchịchị mba Ijipt n’aka ndi soja.
Ndi mba Ijipt nọ n’ọnọdụ ngagharị iwe kemgbe izu uka abụọ na-enwezi añụrị na Mubarak, bụ onye na-achị ha kemgbe afọ iri atọ, mechara rituo n’ọkwa.

 

Ndị Ijipt ka chọrọ ka Mubarak rịtuo n’ọchịchị ozugbo ozugbo

HTaa emezuola ya abalị 15 ngagharị iwe n’Ijipt bidoro, ka ndị Ijipt na-agakwa n’ihu n’ikwusi ike na onye isi ala ha Hosni Mubarak ga-arịturịrị n’ọchịchị.
Wael Ghonim, otu na ndị isi ụlọ ọrụ ukwu a na-akpọ Google bụ onye a gbapụtara na mkpọrọ taa bụ abalị 8 nke ọnwa nke abụọ n’afọ 2011. [Guo akuko a]

Mubarak sị na Ya ga-arịtu n’ọchịchị n’ọnwa Septemba

HN’ikpeazụ, onye isi ala Ijipt Hosni Mubarak ekwuola na ya ga-arịtu n’ọchịchị.
Taa mere ya abalị asatọ ngagharị iwe n’ala Ijipt bidoro. Ndị mmadụ na-ewe iwe, na-asị na onye isi ala ha bụ Hosni Mubarak ga-arịturịrị n’ọchịchị. Taa bụ Tuuzdee, onye isi ala Ijipt kwuru na ya ga-arịtu, ọ bụ eziokwu, kama na ya agaghị eme nke a ruo mgbe ọnwa nke itolu afọ a bụ Septemba rutere isi njedebe. Ọ sị na ya ga-echere maka na ọ bụ otu a ka Iwu Ukwu ala Ijipt siri kwuo. [Guo akuko a]

Cairo na-agba gharaghara

HIsi obodo mba Egypt bụ Cairo na-agba gharaghara kemgbe ụbọchị Tuzdee. Puku kwuru puku ndị mba ahụ na-eme ngagharị iwe. Ha na-akpọ oku ka Prezidenti Hosni Mubarak na ndị isi ọchịchị gọọmenti ya rịtuo n’ọkwa [Gere akụkọ a].

 

Egypt Enweela Vais Presidenti Ọhụrụ

HHosni Mubarak ahọpụtala Omar Suleiman dịka onye ga-ejiziri ya ọkwa Vais Prezidenti. Nke a mere na Satọdee ka imirikiti ndị mba Egypt jụrụ iwete ngagharị iwe ahụ na-aga n’ihu ugbua n’isi njedebe. Ndị mba Egypt chọrọ ka Mubarak, bụ onye na-achị obodo ahụ kemgbe afọ iri abụọ na asatọ, rịtuo n’ọkwa. Ozi anyị nwetere na-akọwa na e gbuolarị ihe karịrị mmadụ iri isii na abụọ, ma merụọ ihe karịrị puku mmadụ abụọ ahụ.

 

Mz Guillaume Soro Awuchiela n’Abuja

HMaazị Guillaume Soro bụ onye Praịm Minista mba Kotovua, na-arụrụ Alassane Ouattara ọrụ, erutego n’Abuja maka ịkparị ụbụbọ n’etiti ya na Prezidenti ala Nigeria bụ Goodluck Jonathan. Mz Soro mere njem a iji kelee Jonathan, bụ onye ji ọkwa dịka onye isi oche otu ECOWAS. Ndi otu ECOWAS kpebiri ịchụtu Laurent Gbagbo n’ọkwa, ma kwadokwezie Alassane Ouattara, bụ onye e kwuru na ya tuuru ugo mmeri na ntụli aka ahụ e mere na mba Kotovua [Gere akụkọ a].
HOtu nwanyị onye omebe iwu na Tucson na steeti Arizona ejirila isi ya ghọrọ mgbọ. Ozi anyị nwetere na-akọwa na otu nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na abụọ gbara Gabrielle Giffords egbe n’isi, ebe nwanyị omebe iwu a so n’otu demokratik pati na-ahazi ọgbakọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na ọnụmara ya dị na Arizona.
A na-akọwa na nwaokorobịa onye omekome a na ndị na-echekwa Giffords kwarịtara mgbọ. A gbatara nwaamadị a egbe tupu ndị uwe oji akpachie ya.
Mmadụ ole na ole tufuru ndụ ha. Ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ nnukwute ahụ.
E bugara Gabrielle Giffords n’ụlọ ọgwụ Tuscon Teaching Hospital. E kwuru na ọnọdụ ahụ ike onye omebe iwu a jọrọ njọ, mana enwebeghị onye ma otu ọ dị ya—ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ.
President Barack Obama kwuputere na ụdị akparama agwa a jọgburu udele ma sigbuo nkapị.

Ottawa ga-eji foto akwa ọnwụ megide ise sịga

HMinistrị okwu gbasara ahụ ike dị n’aka egosiputela foto iri na isii ndi a ga na-amapanye n’okpokoro sịga n’ime afọ puku abuọ na iri na otu. N’ime foto ndi ahụ, nke kachasị emetu ndi mmadu n’obi bụ nke onye minista ngalaba ahụ ike bụ Leona Aglukkaq kpọrọ “foto akwa ọnwụ, nke pụtara ”death bed photo” n’olu bekee.
Onye nọ na foto akwa ọnwụ ahụ bụ nwaada Barb Tarbox, nwa afọ mba Canada nwụrụ n’afọ puku abụọ na atọ gara aga, site n’aka ọrịa kansa nke mkpụrụ akụkụ. Ndi dibịa bekee chọpụtara na Barb Tarbox butere ọrịa ahụ site n’iñụ sịga. Tupu ọnwụ egbuo ya, a matara Barb Tarbox nke ọma dịka onye lụrụ nnukwute ọgụ maka igbochi ise sịga na Kanada. (Gụọ akụkọ a)

Ndị Ripọblịkan Chọrọ Iwepụ Atụmatụ Ahụ Ike Barack Obama Tinyere n’Ọrụ

HKa e mechara ntụli aka elu ikpeazụ n’Amerịka, ndị Ripọblịkan karịziri n’ọnụ ọgụgụ n’ụlọ ndị omeiwu. Ka ha seliri ọgụ na mbàzụ ha ji ejikere ịmalite ọrụ ụnyaahụ, ha yiri oke egwu sị na ha ga-ebibi ya bụ atụmatụ ahụ ike nke onye isi ala Barack Obama, onye Demokrat, rụsiri ọrụ ike were wepụta n’afọ gara aga. Oge ahụ, ndị Demokrat karịrị n’ọnụ ọgụgụ nke mere ka atụmatụ a nwee ike ịgafenwu n’ụlọ ndị omeiwu, na-agbanyeghị sị na ọtụtụ ndị Ripọblịkan ekweghị atụliri atụmatụ ahụ aka elu. Ugbu a ha bụzi ọga n’ọchịchị, ha ekpebiela na ha ga-ewepụ ya bụ iwu. (Gụọ akụkọ a)

Egwuregwu bọọlu ụkwụ

Akụkọ na-abia...

Erimeri ndi Igbo

Akụkọ na-abia...

Ndi Igbo nọ na mba

Ụmụ Igbo na-eme mmemme “Ụbọchị Ndi Igbo” na Winnipeg. Gere ya n'uju »
Mmemme “Ụbọchị Ndi Igbo” na Edminton. Gere ya n'uju »

1 comment: