Sydney Mbachu, Maryland (USA), Satọdee, Julayị 16, 2011.
Courtesy: http://www.igbo.ca/
Courtesy: http://www.igbo.ca/
Ndị otu nnupu isi a na-akọwa na ngagharị iwe ha juputara sọ n’udo, ma na n’agbanyeghị nke a, ndị e duputara ka ha rụọ ọrụ nchekwaba e jirizie ike egbusi ndị na-achọ mgbanwe. N’aka nke ọzọ kwa, a tụọla ndị ngagharị iwe a aka maka ogbugbu ndị ọrụ nchekwaba na mpaghara Siria dị iche iche.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Satọdee, Julayị 16, 2011.
Murdock na nwa ya nwoke ga-abịa n’ihu ọchịchị Briten zaa ajụjụ maka mpụ nke a butegooro oke iwe ọkụ n’ebe ndị Briten na Amerịka nọ. Ka ụfọdụ ndị isi na-ebido iji aka ha arịtu n’ọkwa, ọ naha-adịla ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi News of the World abụ isi kotara ebu, nke na-agaghị eme ebere n’ịgbakasị ya oge iwe ndị mmadụ dakwasara ya.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Nwenezdee, Julayị 13, 2011.
Mmiri agbagbuola ihe ruru mmadụ iri abụọ na Lagos. Oke mmiri ozuzo E nwere na Lagos n’ụbọchị ụka gara aga kpalitere nnukwute ide mmiri, nke kpọlara ihe ruru mmadụ iri abụọ ala mmụọ, ma mebie akụ n’ụba ndị mmadụ.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Tuzdee, Julayị 12, 2011.
O ruchaha mkpụrụ awa 24, ọzọ dawaa n’obodo Madala, nke nọdebere Suleja. Onye okwupute ọnụ ndị uwe ojii na Steeti Niger, bụ Richard Ogunche gwara ndị Channels Television na Mina na ndị uwe ojii nke steeti ahụ na-eme nnyocha maka ịchọpụta ebe aja siri banye na garị.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Mọndee, Julayị 4, 2011.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Mọndee, Julayị 4, 2011.
A nabatara mmadụ asaa ndị ahụ ka ndị omebe iwu sinet mechara nnyocha nke were ha awa asaa. Ndị omebe iwe na Sinet gbara ha ajụjụ. Mmadụ asaa ndị ahụ zara ajụjụ gbasara otu ha siri chị ọchịchị mgbe ha bụbu minista, yana ịhe bụ atụmatụ ha n’ọdị n’ihu m’ọ bụrụ na ha banyekwe n’ọchịchị ọzọ [Gụọọ akụkọ a].
Chidi Igwe, Regina (Canada), Tọzdee, Juunu 23, 2011.
Ọ sị na ọ bụrụ na ndị Nigeria na-ego ngwa ahịa ndị E mere n’ala Nigeria, nke a ga-eme ka ego ọbụla a kpatara na Nigeria, nọrọkwa na Nigeria, ma butekwe ọganiihu nye ala Nigeria.
Jonathan kwuru na otu n’ime atụmatụ gọọmenti ya bụ ime ka ọnọdụ akụ n’ụba ala Nigeria kwụrụ chịm.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Nwenezdee, Juunu 22, 2011.
Onye Ode Akwụkwọ Maka Nchekwaba Obodo bụ Robert Gates na-akọwa na oge a agaghị ezu iji mee mmesị mmesị dị n’ịkpọla ndị agha ọnụ ọgụgụ ha haruru otu ahụ. Na-gbanyeghị nke a, Obama ji n’aka na ọ ga-enwe ike imenwu nke a na-enyeghị nchekwaba obodo Afganistan mmekpa ahụ ọ bụla. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ndị agha ndị a ga-ebido lọtaba n’ọnwa Julaị. Nke a so na atụmatụ inyefe nchekwaba obodo n’aka mba Afganistan n’afọ 2014.
O kwesịkwara ka e bubu n’uche na ọnụ ọgụgụ ụmụ afọ Amerịka ndị kwadoro atụmatụ a gbalitere ofuma kemgbe ọnwa Mee, tụmadị n’ihi na ogbugbu onye isi ndị otu eyimegwu ahụ meziri ka ọ dị ka ọrụ mba Amerịka nwere n’Afganistan agwụchaala.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Sọndee, Juunu 19, 2011.
Jonathan gbakwunyere n’olu bekee na ya ga-emezu nkwa O kwere ndị ala Nigeria. Ọ sịrị: [Gụọọ akụkọ a]
Chidi Igwe, Regina (Canada), Fraịdee, Juunu 17, 2011.
Obama na Jonathan kpara ụbụbọ na New York
Chidi Igwe, Regina (Canada), Satọdee, Juunu 11, 2011.
Obama kpọrọ oku a na New York n’oge ya na onye isi ala Nigeria bụ Goodluck Jonathan nwere nzukọ n’abalị 8 nke ọnwa juunu. Obama nyere ala Nigeria ezigbo otito maka mbọ ha na-agba maka iwete udo na mpaghara Afrịka dị iche iche.
Jonathan kelere gọọmenti mba Amerịka maka nkwado ha nyere ala Nigeria n’oge ntụli aka elu maka ịhọpụta onye isi ala, bụ nke e mere na Nigeria n’oge gara aga.
Super Eagles na Albiceleste ga-ezute ọzọ na Septemba
Chidi Igwe, Regina (Canada), Fraịdee, Juunu 10, 2011.
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ ụkwụ na Nigeria, bụ NFF n'aha ịchafụ, ekwetego na Nigeria na Argentina ga-ezute ọzọ maka ikụgharị bọọlụ a n'agba nke abụọ ya. Onye odeakwụkwọ ngalaba NFF bụ Musa Amadu gwara ndị nta akụkọ na E binyego aka n’akwụkwọ niile kwesiri ime ka agba nke abụọ asọmụmpi a nwee isi. Ndi Super Eagles na ndi Albiceleste ga-ezute ọzọ n’abalị 6 nke ọnwa septemba.
Ndị ọgụ isi ekwe ọnwụ egbuola mmadụ 80 na Pakịstan
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Satọdee, Mee 13, 2011.
Taa ka ya bụ mkpamkpa kpara n’ala Pakịstan ebe ndị ọhụrụ ndụ kwe ọnwụ jiri mgbụọ ogbunigwe wakpo ụlọ ọzụzụ ndị agha na mpaghara ugwu ọdịda anyanwụ, ebe ha gburu mmadụ 80 ma merụọ mmadụ karịrị 140 ahụ. Imirikiti ndị a e gburu bụ ndị agha a ka na-azụ azụ, dị ka Bashir Ahmad Bilour, onye minista si kwuo. Ndị otu Taliban kweere ike na ọ bụ ha gburu ebelebe a iji lụọ ọgụ mmekwụrụ maka onye isi ha e gburu.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Sọndee, Mee 1, 2011.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Satọdee, Eprel 21, 2011.
Ka otu n’ime ndị ha na Jonathan zọrọ yabụ ọkwa onye isi ala, bụ Muhammadu Buhari, na-ekwu na nrụrụ aka dị na yabụ ntụli aka e mere, tigbuo na zọbuo na-ada na mpaghara ugwu ala Nigeria. Ndị isi ekwe ọnwụ ji iwe na ọnụma na-emebi akụ n’ụba na ndụ ndị mmadụ na Steeti Kaduna yana Kano. Anyị nụrụ n’ihe karịrị narị mmadụ atọ anwụọla.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Satọdee, Eprel 16, 2011.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Mọndee, Eprel 11, 2011.
Ntụli aka elu e mere kemgbe ọnwa anọ gara aga biri n’ọgbaaghara, ebe aka na-achịbu mba Kodivụa bụ Gbagbo jụrụ ịrịtu n’ọchịchị na-agbanyeghị na otu jikọtara mba ụwa kwekọrịtara na ọ bụ Ouattara tuuru ugo na ya bụ ntụli aka elu. Kemgbe ọnwa anọ ahụ ka ndọrọndọrọ a nke butegooro oke tigbuo na zọgbuo n’ala Kodivụa na-aga n’ihu. Naarị kwuru naarị mmadụ tụfuru ndụ ha na nzọgbunzọgbu a ka Gbagbo, onye nọgooro n’ọchịchị afọ iri, na-aga n’ihu n’ikwu na ọ bụ ya merịrị na ntụli aka elu ahụ. [Gụọ akụkọ a]
Chidi Igwe, Regina (Canada), Tuzdee, Eprel 5, 2011.
Ruo ugbu a, e nwebeghị onye otu ya bụ demokratik pati pụtara ịchere Obama aka mgba. Ọ bụrụ na nke a emeghị, Obama ga-azọ ọkwa prezidenti na afọ 2012 n'aha otu pati ya bụ demokratik pati.
N’aka nke ọzọ, ndị rịpọblikan pati enwebeghị onye ha họpụtara maka izọrọ ha ọkwa onye isi ala. Ha ga-amalite ntụli aka elu nke okpuru ụlọ ha maka ịhọpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa onye isi ala na nso a.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Tuzdee, Maachị 22, 2011.
Ka otu jikọtara mba ụwa nyechara onye isi ala Libịa bụ Gadhafi iwu ka ọ kwụsị mmekpa ahụ o na-enye ndị ahụ na-achọ ka ọ rịtuo n’ọchịchị, Gadhafi gara n’ihu n’ịtụ mgbụọ ogbunigwe ka o sibu atụ. Nke a kpatara ka mba ụwa bịakọta ọnụ n’ịkwụsị ya bụ nkwafu ọbara, malite na mba France ndị nke jiri ụgbụọ elu ha tụọ ndị agha Gadgafi mgbụọ ogbunigwe. Mba Briten na Amerịka mechara tinye aka n’ịkwụsị ndị ahụ na-alụrụ Gadhafi ọgụ.
Ụgbụọ elu agha Amerịka ahụ, nke a na-akpọ F-15E Strike Eagle, fejere Libịa iji tụkwaa mgbụọ ogbunigwe nke ya oge igwe na-eneye ụgbụọ elu ahu ikikere mechaziri nwee nsogbu, nke mere ka ụgbụọ ya daa ma gbarisie. Onye ofe ụgbụọ elu na onye na-ahaziri ya mgbụọ jiri akwa ahụ fetuo n’udo. Mba Amerịka zutere ma zọpụta otu onye n’ime ha, ebe ndị otu ahụ na-alụso Gadhafi ogu zọpụtara ma chekwaba nke ọzọ nke ọma ruo oge ndị Amerịka bịara kpọrọ ya.
Ka Gadhafi kwere nkwa na ya agaghị akwụsị ọgụ ya, mba ụwa ekwekwaala nkwa na ha agaghị ahapụ ịtụ ndị agha ya mgbụọ ruo oge o jiri rubere iwu ahụ otu jikọtara mba ụwa nyere ya isi.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Tuzdee, Maachị 16, 2011.
Ka ala ọma jijiji butere ide mmiri gbúrú mmadụ 10,000 mechara, ihe ọghọm nke a abụrụla ọsụkịrịgada nke àgbà abụọ nyere mba Japan. Ọchịchị Japan enyela ọtụtụ ndị biketara igwe ndị a nso iwu ka ha zere ịpụta ezi ma ncha, ebe a kpọpụtara ndị mmadụ ọnụ ọgụgụ ha ruru 200,000 ndị kara biketa igwe ndị ahụ nso. Ọghọm a nke na-agbasa n’ikuku ọsọ ọsọ eruchaala isi obodo Japan bụ Tokyo, nke jiri maịlị 150 (kilomita 240) nọrọ na ndịdị obodo Fukushima ebe ọkụ a gbara. Ọnụ ọgụgụ ndị butegooro ọrịa radieshọn a eruola 150.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Sọndee, Maachị 13, 2011.
Otu igwe nuklịa e ji agbahuo ọkụ latiriki na Japan emebiela, ebe ụfọdụ na-atụ anya na ọzọ nwekwara ike imebi. Ala ọma jijiji ahụ merenụ mere ka otu n’ime igwe ndị a dị n’obodo Fukushima gbaa dúm ka mgbụọ ogbunigwe, were gbarisie ụlọ e jiri rụchide ya. Mmebi igwe nke a butere ahụ ọma jijiji n’ebe ndị Japan nọ maka na ha na-atụ egwu sị na nke a ga-ebute mbusa ọghọm radieshọn n’olu bekee.
Ndị dibịa na-agwọ mmadụ itolu ndị butegooro ya bụ ọghọm. Ndị ọrụ na-agbakwa mbọ n’ịgbasa ya bụ igwe mmiri ka o were jụlata oyi. N’agbanyeghị sị na ndị ọrụ na-amawanye n’ọrụ n’atụfụghị oge ọ bụla, ndị isi ọchịchị na ndị ọkachamara ndị Japan ndị ọzọ na-akọwa na ụmụ ihe adịbeghị njọ nke otu ahụ. Ka aka niile banyere n’ọrụ n’idozi ihe a mebirinụ, ma zerekwa ọzọ ime, mba Japan, ndị nke chekwubefere n’igwe nuklịa ófè, ga na-enweta onwe ha n’ọnọdụ enweghị ọkụ latiriki ugboro ugboro.
Chidi Igwe, Regina (CANADA), Satọdee, Maachị 12, 2011.
Ala ọma jijiji ahụ kpalitere ide mmiri sụnami, bu nke nyekwuru aka n’imebi ụlọ, akụ n’ụba, yana igbu ndị mmadụ.
Ozi anyị nwetere na-akọwa na narị mmadụ asaa anwụọla. Ọnụ ọgụ ndị tufuru ndụ ha n’ihe mberede a ka ga-agbago.
Ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ na-mpaghara Japan ebe ala ọma jijiji a metụtara.
N’ọ dị n’ihu, anyị ga-nwete ọnụ ọgụ ndị nwụrụ anwụ, ndị merụrụ ahụ, yana ọnụ ego akụ n’ụba ala ọma jijiji a mebiri.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Tọzdee, Maachị 10, 2011.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Satọdee, Febụwarị 26, 2011.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Nwenezdee, Febụwarị 23, 2011.
Dịka otu onye Ijipt nọbu na Libịa si kwuo, ọgbaaghara dị ebe ahụ karịziri akarị. Nke a mere ka ndị mmadụ nyara ụgbọ ala ha ruo oke ala Libịa na Ijipt, bịa werezie ụkwụ baa Ijipt. [Gụọ akụkọ a] [Gere akụkọ a]
Chidi Igwe, Regina (Canada), Tuzdee, Febụwarị 22, 2011.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Fraịdee, Febụwarị 11, 2011.
Onye vaịs presidenti mba ahụ, bụ Suleiman, wetere ozi arụkwaghị m Mubarak na fraịdee. Mubarak nyefere ọchịchị mba Ijipt n’aka ndi soja.
Ndi mba Ijipt nọ n’ọnọdụ ngagharị iwe kemgbe izu uka abụọ na-enwezi añụrị na Mubarak, bụ onye na-achị ha kemgbe afọ iri atọ, mechara rituo n’ọkwa.
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Tuzdee, Febụwarị 8, 2011.
Wael Ghonim, otu na ndị isi ụlọ ọrụ ukwu a na-akpọ Google bụ onye a gbapụtara na mkpọrọ taa bụ abalị 8 nke ọnwa nke abụọ n’afọ 2011. [Guo akuko a]
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Tuzdee, Febụwarị 1, 2011.
Taa mere ya abalị asatọ ngagharị iwe n’ala Ijipt bidoro. Ndị mmadụ na-ewe iwe, na-asị na onye isi ala ha bụ Hosni Mubarak ga-arịturịrị n’ọchịchị. Taa bụ Tuuzdee, onye isi ala Ijipt kwuru na ya ga-arịtu, ọ bụ eziokwu, kama na ya agaghị eme nke a ruo mgbe ọnwa nke itolu afọ a bụ Septemba rutere isi njedebe. Ọ sị na ya ga-echere maka na ọ bụ otu a ka Iwu Ukwu ala Ijipt siri kwuo. [Guo akuko a]
Chidi Igwe, Regina (Canada), Tuzdee, Febụwarị 1, 2011.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Satọdee, Jenuwarị 29, 2011.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Tuzdee, Jenuwarị 25, 2011.
Chidi Igwe, Regina (Canada), Satudee, Jenuwarị 8, 2011.
A na-akọwa na nwaokorobịa onye omekome a na ndị na-echekwa Giffords kwarịtara mgbọ. A gbatara nwaamadị a egbe tupu ndị uwe oji akpachie ya.
Mmadụ ole na ole tufuru ndụ ha. Ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ nnukwute ahụ.
E bugara Gabrielle Giffords n’ụlọ ọgwụ Tuscon Teaching Hospital. E kwuru na ọnọdụ ahụ ike onye omebe iwu a jọrọ njọ, mana enwebeghị onye ma otu ọ dị ya—ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ.
President Barack Obama kwuputere na ụdị akparama agwa a jọgburu udele ma sigbuo nkapị.
Chidi Igwe, Fraịdee, dizemba 31, 2010
Onye nọ na foto akwa ọnwụ ahụ bụ nwaada Barb Tarbox, nwa afọ mba Canada nwụrụ n’afọ puku abụọ na atọ gara aga, site n’aka ọrịa kansa nke mkpụrụ akụkụ. Ndi dibịa bekee chọpụtara na Barb Tarbox butere ọrịa ahụ site n’iñụ sịga. Tupu ọnwụ egbuo ya, a matara Barb Tarbox nke ọma dịka onye lụrụ nnukwute ọgụ maka igbochi ise sịga na Kanada. (Gụọ akụkọ a)
Sydney Mbachu, Maryland (USA), Fraịdee, Jenuwarị 7, 2011.
Ndi Igbo nọ na mba
Ụmụ Igbo na-eme mmemme “Ụbọchị Ndi Igbo” na Winnipeg. Gere ya n'uju »Mmemme “Ụbọchị Ndi Igbo” na Edminton. Gere ya n'uju »
anydesk premium license key
ReplyDelete